ỌNỌDỤ EKPEMEKPE NAMMEPE OBODO: EKPEMEKPE ỤKA KRAỊST DỊ KA IHE NLERE ANYA

Gladys Ifeoma Udechukwu (PhD)

Abstract


N’ọgbakọ nke afọ a nke ndị Center for Unity Conflict Resolution & Development na Department of Psychlogy Enugu State University gbakọrọ aka wee chịkọbọ site n’isiokwu a kpụ n’ọnụ a kpọrọ na Bekee “Nigerian Development, the Role of Education” bụ nke a pịrị aka  wee họrọ ma bụrụkwa  nke dabara nke ọma n’etu ala anyị bụ Naịjirịa si debe imi na ọnụ ugbu a. Ọnọdụ ala anyị bụ Naịjirịa nọ na ya n’oge a abụghị nke a na-akọrọ onye ọ bụla akọrọ maka na ọ bụ ihe agba n’aka nke a gaghị achọ enyo a ga-eji lee ya. Ọ bụrụ na ọ bụ ka e sikwuo Naịjirịa na obodo ndị ọzọ mepere emepe ma ọ bụ ka a tụọ Naịjirịa n’ihe ọtụtụ e ji atụ obodo mepere emepe, a ga-achọpụta na Naịjirịa achịtaghị aja n’ebe mmepe dị. Naịjirịa so n’otu mba na mba ụwa niile Chineke ji ọtụtụ ihe e ji eme ka obodo mepee wee gọzie mana nsogbu e nwere bụ inwe ezi usoro ọchịchị na ezi nhazi ihe, nke Naịjirịa na-enweghị.  N’oge gboo, mgbe Zik, Awolowo, Gorwon, Mohammed na ndị ọzọ nwere egwu Eke kere ụwa n’ime ha n’agbanyeghị ụdịdị ekpemekpe onye ọ bụla nọ na ya na-achị, e nwere udo, mmepe na agamniihu n’ala anyị. Ka ọ dịzị ugbu a, a chọpụtara na ndị nọ n’ọchịchị ugbu a enweghịzị egwu Chineke nke mere na ha na-emezị etu ọ masiri ha nke mere na e nweghịzị ezi mmepe tọrọ atọ. Mmadụ inwe egwu Chineke na ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ya nọ bụ ihe na-eme ka onye ọ bụla bara n’ọchịchị chịa nke ọma. Ọnọdụ Naịjirịa nọ ugbu a n’ebe mmepe dị na-egosi na ndị ọchịchị na-achị ugbu a enweghịkwa egwu Chineke n’ime ha.  Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji họrọ isiokwu a iji zi ndị ụka bụ ndị na-enye nkuzi maka Chineke, ịtụ egwu Chineke na ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya na ha nwere ọrụ n’ịgbazi akparamagwa ndị nọ n’ọchịchị site na nkuzi ha na-akuzi iji weta mgbanwe n’obibi ndụ ndị na-achị achị nke ga-enyekwa aka wee weta mmepe na Naịjirịa. A gbasoro atụtụ na-eleba anya n’usoro ọchịchị na nke mmekọrịta  mmadụ na ibe ya wee mee nnyocha ma depụtakwa ihe e nyochapụtara. A tụrụ anya na ihe ederede a ga-enye aka iweta mgbanwe na ndụ ndị ọchịchị n’ụzọ ha si achị ma mee ka e nwee mmepe tọrọ atọ n’ala anyị bụ Naịjirịa.


Keywords


Ekpemekpe, Mmụta, Mmepe Obodo na Ụka Kraịst

Full Text:

PDF

References


Dallmayr, F. R. (2004). Dialogue Among Civilization: Some Eụamplary Voices

Davic. E. (2016). 3 Differences Between Christianity and Other Religions. The Cripplegate. Com. Jackson Hole WY.

Dewey, J. (1936). Eụperience and Education. New York: Collier Books.

Groody, D. (2007). Globilization, Spirituality and Justice. New York: Orbis Books.

Hayas J.H. (1953). Christianity and Western Civilization. Standford University Press:

Halpin, D. (2003). Hope and Education: The Role of the Utopian Imagination. London: Routledge Falmer.

Hooks B. (2003). Teaching Community: A Pedagogy of Hope. New York: Routledge.

Idowu, E. B. (1987). African Traditional Religion. London: SCM Press.

Illeris, K. (2002). The Three Dimensions of Learning: Contemporary Learning Theory in the Tension Field Between the Cognitive, the Emotional and the Social. Frederiksberg: Roskilde University Press.

Moltmann, J. (1967). Theology of Hope: On the Ground and the Implication of a Christian Eschatology. New York: Harper and Row.

Thomas, G. (2013). Education: A Very Short Introduction. Oụford: Oụford University Press.

Onwuka, U. (1988). Aspect of education for all. Nigeria: Vivian and Vivian’s Publishers.

The Bible Society of Nigeria. (2006). The Authorized King James Version. Korea: Korean Bible Society.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


 

 

 

 

ISSN (Print): 2276-8645

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.